Mbido Dash: Ihe nile banyere ya bụ ego Digitalu



Dash bụ otu n'ime ego di na weebu gbadosiri ụkwụ ike n'ime cryptocurrency enwere.
ọ werela ọnọdụ onye nke iri na ime cryptocurrency nile di n' uwa, bia kwa nwee azumahia ijeri isii ma na azuta kwa narị nde abụọ na ụbọchị. Dash bu nnukwu ihe bia nwe kwa ọtụtụ uru n'ime ya.

Na Dash Naijiria, anyi no na igbasa ozi banyere Dash, ihe eji ya eme na ụzọ di iche iche ma etu ndi Naijiria ga esi ji ya bu ego were nyere onwe ha aka na ndu ha ma bia nwe kwa ego na efu. Nke'a na akọwa ihe Dash bụ, otú o si arụ ọrụ, ya na ka osiri puta.


Na isi Mbido Enwere ọchịchịrị
E weputara DAsh na Jenụwarị 2014, oge ahu ọ bụ Darkcoin, onye no na isi oche ya mgbe ahu bu Evan Duffield. Eji otu afo gbanwe aha ya bụrụ Dash. Dash nwere ọtụtụ ihe mere ya ọpụrụ iche banyere ego cryptocurrency ndi ọzọ, ike goomenti elughi ya, ọnwe kwara etu ndi mmadu ga esi zigara onwe ha ego ogaghi egosi aha ha.

ọrụ Dash ka na ga n'ihu, ndi Dash Core bu otu na ahu maka ya. Ugbua mmadu iri atọ bụ ndi ụlọ ọrụ ha, mmadu iri abụọ, bu kwa ndi ọrụ na eme mbialute ma bia nwe kwa otu ndi na eso ha na enyere kwa ha aka n'efu. Ha nile choro otu ihe: ya bu igbasa ozi maka DAsh na ihu na ọrụrụ otụtụ aka. Ego otu no na isi ji akawado oru a nile bụ site na network Dash ma na oru ndi ngwuputa. N'ime ego ndi a ka esi kwa akwu ndi mgbasa ozi ugwo, ime ka otutu wee nabata dash.


Usoro Ochichi ya

Ochichi ebe enweghi otu ndi nwere ikeke bu ihe na ewu ewu afo gara aga.Dash bu otu n'ime nzuko mere ya ma ganihu. Nke'a banyere na oweghi onye nwere ikeke n'elu ya. Mmadu nile ga ekwekorita onu tupu agbanwee ihe obula na Dash network. Ndi nwere masternode bu ndi nwere ikeke itu akwukwo banyere ihe obula maka Dash.


Masternode na Ngwuputa

Cryptocurrency dika Bitcoin bu ndi ngwupụta(Miners) na echekwaba ya. ọrụ ha bu ihu na ego ọbụ na biara na network a ruru ebe ọ na aga, ya bụ blockchain. ọrụ blockchain bụ idekoba ahai nile zuru na network a ihu na ụbọchi oji ga dabara. Eme sia ihe ndia nile, ugwo ọrụ ndi ngwuputa bụ inweta ntakiri ego na nke obula ha meziri.
Dash bụ system nke hybrid akporo masternode na echekwaba ya, ha na ahu maka nchekoba ya ihu na ihe nile na aga nke oma.


Atụmatụ Nzuzo
Na mbu ọrụ cryptocurrency bu iji ziga ego na egosi putaghi aha onye zigara ya, eji ya wee nwale ụlọ akụ. ọtụtụ mgbanwe na blockchain mere nyocha ego ndi mmadụ zigara adi mfe. Dash bụ ndi izizi meputara atumatu nzuzo. Nke a mere na iga ezigara onye ọzọ Dash na nzuzo, ihe akporo ya bụ PrivateSend.


Otu Esi enweta ma jiri Dash

Site na akụkọ ihe mere eme akoru banyere Dash, gosiri na ọ bụ ihe kariri cryptocurreny maka na ndị ọkà mmụta ga eji ya meputa ọtụtụ ihe n'ime onwe ha. Ihe eji ya emeputa di ọtụtụ. internet bu Dash.org kọwara na Dash bu ego komputa a na agbanwe n'ebe ọ bụla.

I ga enwe Dash tupu ijiri ya zụta ihe. enwere otutu ụzọ iji mee nke a , ma na nke kasi mfe bu igbanwe ya na bitcoin na ụlọ akụ cryptocurrency. ụfọdụ ụlọ mgbanwe ga ekwe ka ijiri ego fiat zuta Dash. ụzọ ozo inweta Dash bụ kwa na ngwuputa ma obu inwe masternode. Enwe kawra ike inweta ya na iru otutu oru na internet.


Uzo Esi echekwaba Dash

A na echekwaba dash na obere akpa internet. Enwere otutu akpa dika Dash wallet na Dash Core, nke di na ụdi Android na IOS. Enwe kwera otutu obere akpa na ejiko kwa otutu cryptocurrency onu dika Jaxx na Coinomi, ndi a ga enye kwara gi aka itinye ma chekwaba Dash. Ufodu obere akpa di kwa na ụdi ana emetuta aka di ka USB, akporo nke'a Trezor, o ga echekwaba kwa Dash. Enwe kwara ike  ichekwaba Dash na ụlo mgbanwe cryptcurrency na internet.


Ụzọ a ga - esi eji gbanwe Dash

Dash nwere otutu ihe aga eji ya mmeputa: Ihe ndi a bu
Inwere ike iji ya zuta ihe na internet, na etinyeghi otutu ihe banyere onwe gi. Dash agaghi aju gi ihe miri emi banyere onwe gi  ma obu nyefe ya na aka onye ozo, nke enwere ike iji me ihe ahuho i na amaghi maka ya.

ọ na enyere ndi na azu ahia inweta kirikiri ego, ma di kwa mfe karia akwuko kaadị ndi uloaku.
Otutu ndi Naijiria umenne na umunna ha bi na mba ofesi ga ezigala ha ego Dash ngwa ngwa ma dikwa ọnụ ala.
otutu na enweghi ulo aku ga eji DAsh mere ebe odebe aku ha, onweghi kwa ahuhu di na inwe otu.

Umu amaala anyi ndi na enweghi nchekwube na naira ka oghara ida na ugwu ya nwere ike itinye ego ha na DAsh, oga abanwanye na odi n'ihu.
Ihe ozo enwere ike iji Dash eme bu nkwadu ikpakoba ego na atughi egwu ọ bụ na maka ndi ụlọ akụ i mechi ya. Otu ihe aga eji Dash eme di nnukwu.

Ọ bụrụ na ị nwere mmasị inwe Dash, ụzọ kachasị mma isi ịmalite bụ site na inweta obere akpa eji echekwaba ya di na Dash.org ma ga zuta ya na gidicoin.com, wallofcoin.com ma o bu iwere BTC gbanwere ya na luno.com. Ga na shapeshift.io ka igbanwe BTC na DAsh. Mgbe  ị malite iji ya ma ghọta otú o si arụ ọrụ, i ga ahu uru nke di naya. Na DAsh Naijiria, anyi gbadoro ukwu ihu na anyi na agbasa ozi banyere uru Dash bia kwa na enyere ndi umunne anyi aka na ala anyi ihu na ha nwere ego na efu.

A bia na ihe banyere ego, o na di mma inyocha nke oma, ọ bia buru kwa maka cryptocurrency. i nwee ajuju ọ bụ na banyere Dash oga adi anyi obi ụtọ iza maka ya. Anyi kwenyere na DAsh bụ crytocurrency kacha mma na ahia ugbua. Anyi no na oru ihu na anabatara ya na uju na ebe nile na ala anyi bu Naijiria, bia mekwa otu Dash ka odi mma maka onye ọ bụ na.


Dash address
XmvbJ8LwLe8xCQCRnhsJcwSmhVtXrpjXRH


Comments

Popular posts from this blog

NAIRA AGAHI EME GI OGARANYA

Enwere onye ọ bụla na-ekwu okwu banyere Dash na ala anyị bụ Naijiria